Tuesday, January 20, 2015

Umu nne m umu Igbo ndewo nu. Ihe m choro ikwu di oke mkpa mweru si ka m kwuo ya na Igbo. Anoghi m na elu uwa a na 1966, ma na aguo na m otutu akwukwo gbasara etu oku siri bata na Nigeria, weru gbasaa ala Igbo ma gbagbue otutu umu Igbo. Na eziokwu o na adi m ka Nigeria o nachighakwara na 1966. Onokata akpata oyi ama m na ahu. Ufodu ife na adaputa, dika certificate sikwo certificate a ya asihoo na adi m ka oga amunye oku na mba Nigeria.
Ana m ayo Chineke ka o chekwaba ndi Igbo. Ndi Igbo enweghi ihe ha tunyere, ma nke ha ga ekete na ife na amunye oku a-onye ya na umu nne ya na ndi enyi ya ga eri aku Nigeria aho ano. Chineke biko ekwena ka obara umu Igbo ggafuo na nkiti ozo. Onye furu anaho asi ka ya fu ozo.
Abia na nke ozo, ka anyi bu umu Igbo were kwa uche na amamihe na aga. Ka anyi jide ire na onu anyi aka. Ka anyi ghara idabanye na ife agbasa ho anyi.